Psalms 127

Abụ nrigo, nke Solomọn.

Chineke dị mkpa

1Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ,
ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo,
nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.
2Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ
na-adọgbu onwe gị nʼọrụ
ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị,
nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.

3Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,
ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
4Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,
otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.
5Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ
onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.
Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro
na-arụrịta ụka nʼama.
Copyright information for IboBIU